1Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a.
2Belak we me dika Belam kwuru; Belak na Belam we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.
3Belam we si Belak, Guzo onwe-gi n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma ka m'je; eleghi anya Jehova gābia izutem: ma ihe ọ bula Ọ gēme ka m'hu m'gēgosi kwa gi ya. Ọ we je ugwu nke ọhia nādighi.
4Chineke we zute Belam: ọ we si Ya, Ebe-ichu-àjà asa ahu ka m'doworo n'usoro, m'we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-aja ọ bula.
5Jehova we tiye okwu n'ọnu Belam, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.
6Ọ we jeghachikuru ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya onwe-ya na ndi-isi Moab nile.
7O we tua ilu-ya, si,
8
9
10
11Belak we si Belam, Gini ka i meworom? ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kutere gi, ma, le, i gọziwo ha nke-uku.
12Ọ we za, si, Ihe Jehova nētiye n'ọnum, ọ̀ bughi nka ka m'gēlezi anya ikwu?
13Belak we si ya, Biko, sorom je n'ebe ọzọ, ebe i gēsi hu ha; nání nsọtu-ha ka i gāhu, ma i gaghi-ahu ha nile: gi kọcha-kwa-ram ha site n'ebe ahu.
14Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.
15Ọ si Belak, Guzo onwe-gi n'ebe a n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma mu onwem gēzute Jehova n'ebe ahu.
16Jehova we zute Belam, tiye okwu n'ọnu-ya, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.
17Ọ we biakute ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya na ndi-isi Moab. Belak we si ya, Gini ka Jehova kwuworo?
18Ọ we tua ilu-ya, si,
19
20
21
22
23
24
25Belak we si Belam, Akọcha-kwa-la ha ma-ọli agọzi-kwa-la ha ma-ọli.
26Belam we za, si Belak, Àgwaghm i, si, Ihe nile nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēme?
27Belak we si Belam, Biko, bia, m'gēkuru gi je ebe ọzọ; eleghi anya ọ gēzi ezi n'anya Chineke ka i si n'ebe ahu kọcharam ha.
28Belak we kuru Belam je n'elu Peoa, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di.
29Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a.
30Belak we me dika Belam siri, ọ we sure otù oke-ehi na otù ebulu n'ebe-ichu-aja ọ bula.