ỌNU-ỌGUGU 29:1-40 IGBOB1970 - Bible AI

1Ọzọ, n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ubọchi uda-opì ka ọ gāburu unu.

2Unu gēme àjà-nsure-ọku ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova; otù nwa-oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ nke zuru okè:

3na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu oke-ehi ahu, uzọ abua n'uzọ iri iji chu ebulu ahu,

4na otù uzọ n'uzọ iri iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu:

5na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu:

6nāgughi àjà-nsure-ọku ọnwa ọhu, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, dika ikpé-ha si di, ibu ihe isì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.

7Ọzọ, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje.

8ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova, bú ihe ísì utọ; otù nwa-oke-ehi, otù ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otú arọ; nke zuru okè ha gāburu unu:

9na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu otù ebulu ahu,

10otù uzọ n'uzọ iri, otú uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu:

11otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nmehie nkpuchi-nmehie, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.

12Ọzọ, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje, unu gēme-kwa-ra Jehova ememe ubọchi asa:

13unu gēweta kwa nso àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova; umu-oke-ehi iri na atọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ; nke zuru okè ka ha gābu:

14na onyinye-inata-iru-ọma-ha, utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu oke-ehi ọ bula nime oke-ehi iri na atọ ahu, uzọ abua n'uzọ iri iji chu ebulu ọ bula nime ebulu abua ahu,

15otù uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu iri na anọ ahu:

16na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

17N'ubọchi nke-abua unu gēweta kwa nso umu-oke-ehi iri na abua, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:

18na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na abua ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

19na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.

20N'ubọchi nke-atọ kwa oke-ehi iri-na-otù, ebulu, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè;

21na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na otù ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

22na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inatu-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

23N'ubọchi nke-anọ kwa oke-ehi iri, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:

24na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha iji chu oke-ehi iri ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

25na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

26N'ubọchi nke-ise kwa oke-ehi iteghete, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otú arọ, nke zuru okè;

27na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha iji chu oke-ehi iteghete ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

28na otú nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

29N'ubọchi nke-isi kwa oke-ehi asatọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ zuru okè:

30na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi asatọ ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

31na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya nile.

32N'ubọchi nke-asa kwa oke-ehi asa, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:

33na onyinye-inata-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi asa ahu, na iji ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

34na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

35N'ubọchi nke-asatọ nb͕ochi gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje:

36ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku. bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova:' otú oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:

37onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-oṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi ahu, na iji chu ebulu ahu, na iji chu umu-aturu ahu, gādi n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

38na otù nkpi iji chu aja-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

39Ndia ka unu gēmere Jehova na mb͕e nile unu akara àkà, nāgughi nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, iji chu àjà-nsure-ọku nile unu, na iji chu onyinye-inata-iru-ọma nile unu, na iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu nile unu, na iji chu àjà-udo nile unu.

40Moses we gwa umu Israel okwu dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di.

le>