ABÙ ỌMA 103:1-22 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke Devid. Gọzie Jehova, nkpuru-obim; Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya.

2Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:

3Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile;

4Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi; Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche:

5Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo.

6Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕u Ezi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe.

7Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile, Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile.

8Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere.

9Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu; Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe.

10Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi.

11N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa, Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya.

12Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.

13Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya, Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya.

14N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi; Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu.

15Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di; Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko.

16N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi; Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ.

17Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya, Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu;

18Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya, Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha.

19Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe; Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile.

20Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya, Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya, N'ige nti olu nke okwu-Ya.

21Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile; Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ.

22Gọzienu Jehova, unu ọlu-Ya nile, N'ebe nile Ọ nāchi: Gọzie Jehova, nkpuru-obim.

e>