ABÙ ỌMA 104:1-35 IGBOB1970 - Bible AI

1Gọzie Jehova, nkpuru-obim. Jehova, Chinekem I di uku nke-uku; Ebube na ima-nma ka I yiriworo dika uwe.

2Gi Onye nēji ìhè kpuchi Onwe-gi dika uwe-nb͕okwasi; Onye nēseti elu-igwe dika ákwà-nkwuba:

3Onye nēdo ihe-njikọta nke ime-ulo-elu-Ya nile nime miri: Onye nēme igwe-oji ka ha buru ub͕ọ-ala-Ya; Onye nējeghari n'elu nkù abua nke ifufe:

4Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe; Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:

5Ọ tọwo ntọ-ala uwa n'elu ọnọdu-ya guzosiri ike, Ka aghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6I were ob͕u-miri kpuchie ya dika uwe; N'elu ugwu nile ka miri nēguzo.

7Site n'ibasi-nba-ike-Gi ha nāb͕alaga; Site n'olu éb͕è-elu-igwe-Gi ha nāzọli ọsọsọ;

8(Ugwu nile nārigo, ndagwurugwu nile nārida;) Rue ebe ahu nke I tọrọri ntọ-ala-ya nye ha.

9I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya; Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa.

10Gi Onye nēzipu isi-iyi di iche iche ka ha ba na ndagwurugwu; N'etiti ugwu ka ha nērù:

11Ha nēnye anu ọhia ọ bula miri iṅu; Inyinya-ibu-ọhia nēmeju akpiri-ikpọ-nku-ha.

12N'akuku ha ka anu-ufe nke elu-igwe bi, Ha nēsi n'etiti alaka-osisi me ka olu-ha da udà.

13I bu Onye nēsi n'ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri: Afọ nēju uwa site na nkpuru nke ọlu-Gi nile.

14I bu Onye nēme ka ahihia puere anu-ulo Nēme kwa ka ihe akuru n'ala puere ọlu-ubi madu; Ime ka nri si n'ala puta:

15Na manya-vine nke nēme ka obi madu ṅuria, Ime ka iru-ya nēb͕upu site na manu, Na achicha nke nēme ka madu nwe ume n'obi.

16Afọ nēju osisi nile nke Jehova; Bú osisi cedar nke Lebanon, nke Ọ kuworo;

17Ebe umu-nnunu na-akù akwú: Ub͕ala, osisi fir bu ulo-ya.

18Ugwu nile di elu diri ewu-ọhia; Nkume nile di elu buru aṅu ebe-nb͕abà.

19O mere ọnwa ka ọ buru ihe igu mb͕e di iche iche akara àkà: Anyanwu mara ọdida-ya.

20I nēme ka ọchichiri b͕a, o we buru abali; Nime ya ka anu nile nke oké ọhia nākpuputa.

21Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u, N'ichọ kwa ihe-oriri-ha n'aka Chineke.

22Anyanwu nāwa, ha we chikọta onwe-ha, We mākpuru n'ebe-obibi-ha di iche iche.

23Madu nāpu ga ọlu-ya Ga kwa ọlu-ubi-ya rue anyasi.

24Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova! N'amam-ihe ka I meworo ha nile: Uwa juputara n'ihe I nwetara.

25Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua, Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu, Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku.

26N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga; Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.

27Ha nile nēle anya Gi, Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.

28I nēnye ha, ha achikọta ya; I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha.

29I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji; I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume, We laghachi n'ájá-ha.

30I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha; I we me ka iru ala di ọhu.

31Ka ebube Jehova dirue mb͕e ebighi-ebi; Ka Jehova ṅuria n'ọlu-Ya nile:

32Onye nēlegide uwa, o we ma jijiji; Ọ nēmetu ugwu aka, ha we kwua anwuru-ọku.

33M'gābùku Jehova abù n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.

34Ka ntughari-uchem tọ Ya utọ: Mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova.

35Ka eme ka ndi-nmehie si n'uwa gwusia, Ka ndi nēmebi iwu ghara kwa idi ọzọ. Gọzie Jehova, nkpuru-obim. Tonu Ja.

e>