ABÙ ỌMA 105:1-45 IGBOB1970 - Bible AI

1Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya; Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.

2Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma; Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.

3Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya: Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.

4Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile.

5Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo; Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;

6Unu nkpuru Abraham, bú orù-Ya, Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.

7Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi: N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di.

8O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;

9Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara, Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;

10O we me ka o guzoro Jebok ibu ukpuru, Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:

11Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean, Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:

12Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole, E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;

13Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ, Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ.

14Ọ kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha; O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;

15Si, Unu emetula ndim etere manu aka, Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam.

16O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu; Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri.

17O zìri otù nwoke iga n'iru ha; Erere Josef ka ọ buru orù:

18Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike; Nkpuru-obi-ya bàra n'ígwè:

19Rue mb͕e okwu-Ya rère; Okwu-ọnu Jehova nuchara ya.

20Eze ziri ozi, we tọpu ya; Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ.

21O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya, Na onye nāchi ihe nile o nwetara:

22Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ, Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe.

23Israel we bata nime Ijipt; Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n'ala Ham.

24O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku; O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha.

25Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì, Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ.

26O zigara Moses, bú orù-Ya, Na Eron onye Ọ rọputara.

27Ha doro n'etiti ha ihe iriba-ama-Ya nile, Do kwa ihe-ebube di iche iche n'ala Ham.

28O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie; Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile.

29Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara, We me ka azù-ha nwua.

30Ala-ha nuputara awọ, N'ime-ulo nile nke ndi-eze-ha.

31O kwuru okwu, odudu we bia, Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile.

32O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé, Na ọku nēnwu enwu n'ala-ha.

33O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe; Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha.

34O kwuru okwu, igurube we da, Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu,

35Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n'ala-ha, Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha.

36O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha, Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.

37O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo: Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile.

38Ijipt ṅuriri mb͕e ha putara; N'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ha.

39Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi; Na ọku inye ìhè n'abali.

40Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia, O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha.

41O meghere oké nkume, miri we rùputa; Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri.

42N'ihi na O chetara okwu nsọ Ya, Na Abraham, bú orù-Ya.

43O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta, Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta.

44O we nye ha ala nile nke mba Kenean nile; Ọ bu kwa ihe ndi ọzọ di iche iche dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inwe ka ha nwetara:

45Ka ha we debe ukpuru-Ya nile, Riba kwa iwu-Ya nile ama. Tonu Ja.

e>