1Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2Ka ndi Jehova b͕aputaworo nāsi otú a, Bú ndi Ọ b͕aputaworo n'aka onye-nkpab͕u;
3O si-kwa-ra n'ala nile chikọputa ha, Site n'Iru-anyanwu na site n'Ọdida-anyanwu, Site n'Ugwu na site n'oké osimiri.
3
4Ha fughariri n'ọzara n'uzọ nke bu nání ala tọb͕ọrọ n'efu; Ọ dighi obodo obibi ha chọtara.
5Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu, Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha.
6Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we naputa ha n'aka nkpà-ha nile.
7O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi, Ijeru obodo obibi.
8Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
9N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike, Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.
9
10Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu, Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè;
11N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke, Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu:
12O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu; Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka.
13Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile.
14O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta, Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.
15Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
16N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla, B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.
16
17Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'ala Site n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha.
18Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú; Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu.
19Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha na nkpà-ha nile.
20O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma, O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.
21Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
22Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele, Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.
22
23Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o, Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri;
24Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova, Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi.
25N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ, Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu.
26Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile: Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n'ọnọdu ọjọ ha.
27Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè, Amam-ihe-ha nile nāla kwa n'iyì.
28Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile.
29Ọ nēme ka oké ifufe guzo n'idere du, Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti.
30Ha we ṅuria, n'ihi na ha nādaju; O we durue ha n'ótú nātọ ha utọ.
31Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
32Ka ha me kwa Ya ka Ọ di elu nime nkpọkọta ndi-Ya, Ka ha to kwa Ya nime nnọkọ ndi-okenye.
32
33O nēme ka osimiri ghọ ọzara, O nēme kwa ebe miri nāsuputa ka ha ghọ ala kpọro nku;
34Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú, Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.
35Ọ nēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, Ọ nēme kwa ka ala nke kpọrọ nku ghọ ebe miri nāsuputa.
36O we me ka ndi agu nāgu biri n'ebe ahu, Ha we dozie obodo obibi;
37Gha nkpuru n'ubi, kua ubi-vine di iche iche, Nweta nkepuru nke ihe-ọmume.
38Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku; Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.
39Ọzọ, ha nēbilata, we ruda n'ala, Site na nmeb͕u, na ihe ọjọ, na iru-újú.
40Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha, We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe uzọ nādighi.
41Ọzọ, Ọ nēme ka ob͕eye si na nweda-n'ala nọ n'ebe di elu, Ọ nēme kwa ka ọ ghọ ab͕uru dika ìgwè ewu na aturu.
42Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria; Ma ajọ omume nile ekpuchiwo ọnu-ya.
43Onye ọ bula nke mara ihe gāriba kwa ihe ndia ama, Ha gātukwasi kwa uche n'ebere nile nke Jehova.