ABÙ ỌMA 108:1-13 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù, Abù Ọma Devid. Edoziwo obim, Chineke; M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma, ọbuná nsọpurum ka m'gēji bù abù.

2Teta, une na ubọ-akwara: M'gākpọte chi-ọbubọ.

3M'gēkele Gi n'etiti ndi nile di iche iche, Jehova: M'gābùku kwa Gi abù ọma netiti mba nile.

4N'ihi na ebere-Gi di uku kari elu nke elu-igwe, Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé.

5Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke: Ka ebube-Gi di kwa n'elu uwa nile.

6Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya, Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.

7Chineke ekwuwo okwu n'idi-nsọ-Ya: ka m'ṅuria ọṅu-agha: M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.

8Mu nwe Gilead; mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem.

9Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: N'aru Filsitia ka m'gēti nkpu.

10Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike? Ònye duruworom rue Edom?

11Ọ̀ bughi Gi, Chineke, juworo ayi aju? I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha-ayi, Chineke.

12Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u: N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.

13Nime Chineke ayi gēme ihe dìnkpà: Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpabu ayi.

e>