ABÙ ỌMA 112:1-10 IGBOB1970 - Bible AI

1Tonu Ja. Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova. Nke ihe nile O nyere n'iwu nātọ utọ nke-uku.

2Ndi-dike ka nkpuru-ya gābu n'uwa: Agāgọzi ọb͕ọ ndi ziri ezi.

3Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n'ulo-ya: Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

4Ihè awaliwo n'ọchichiri nye ndi ziri ezi: Ọ bu onye-amara, na onye nwere obi-ebere, na onye ezi omume.

5Ọ diri nwoke ahu nma, bú onye nēme-ebere, nēbinye kwa madu ihe; Ọ gākwagide okwu-ya nile n'ikpé.

6N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewezuga ya n'onọdu-ya: Ihe-ncheta ebighi-ebi ka onye ezi omume gābu.

7Ọ gaghi-esite n'ihe ọjọ anuworo tu egwu: Edoziwo obi-ya, ebe ọ nātukwasi Jehova obi.

8Ihe anākwagide ka obi-ya bu, ọ gaghi-atu egwu, Rue mb͕e ọ gēlekwasi ndi nākpab͕u ya anya.

9Ọ ghasawo àkù-ya, o nyewo ndi-ob͕eye ihe; Ezi omume-ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi: Agēwere nsọpuru me ka mpi-ya di elu.

10Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe; Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa: Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n'iyì.

e>