ABÙ ỌMA 113:1-9 IGBOB1970 - Bible AI

1Tonu Ja. Tonu, unu ndi-orù Jehova, Tonu aha Jehova.

2Ka aha Jehova buru ihe agọziri agọzi Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

3Site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya Aha Jehova gābu ihe anēto eto.

4Jehova di elu n'elu mba nile, N'elu elu-igwe ka ebube-Ya di.

5Ònye di ka Jehova, bú Chineke-ayi? Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di elu inọdu ka eze,

6Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di ala ilekwasi Elu-igwe na ilekwasi uwa anya.

7Ọ bu onye nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, O nēsi n'ebe ikpofu ahihia bulie ob͕eye elu;

8Ime ka ya na ndi amara aha nọkọ, Ka ya na ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ya nọkọ.

9Ọ bu onye nēme ka nwayi-àgà nke ulo biri n'ezi-na-ulo nke aka ya, Buru nne nāṅuri ọṅu nke muworo umu-ndikom. Tonu Jehova.

>