ABÙ ỌMA 114:1-8 IGBOB1970 - Bible AI

1Mb͕e Israel siri n'Ijipt puta, Mb͕e ulo Jekob siri na ndi nātatọ okwu puta;

2Juda ghọro ebe nsọ Ya, Israel ghọrọ ala Ọ nāchi.

3Oké osimiri huru ya, we b͕alaga; Jọdan chighariri la azu.

4Ugwu nile wuliri elu dika ebulu, Ugwu ntà nile wuliri elu dika umu-aturu.

5Gini nēme gi, oké osimiri, na i nāb͕a ọsọ? Gini nēme gi, Jọdan, na i nēchighari la azu?

6Gini nēme unu, ugwu, na unu nāwuli elu dika ebulu? Gini nēme unu, ugwu ntà, na unu nāwuli elu dika umu-aturu?

7Ka o b͕ue gi nb͕u, gi uwa, site n'iru Onye-nwe-ayi, Site n'iru Chineke nke Jekob;

8Onye b͕anwere oké nkume ka ọ ghọ ọdọ-miri juputara na miri, B͕anwe ọmú ka ọ ghọ isi-iyi miri.

>