ABÙ ỌMA 115:1-18 IGBOB1970 - Bible AI

1Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi, Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru, N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi.

2N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Biko, òle ebe Chineke-ha nọ?

3Ma Chineke-ayi nọ n'elu-igwe: Ihe nile nke tọrọ Ya utọ ka O meworo.

4Arusi nile ha bu ọla-ọcha na ọla-edo, Ọlu aka madu.

5Ha nwere ọnu, ma ha adighi-ekwu okwu; Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;

6Ha nwere nti abua, ma ha adighi-anu ihe; Ha nwere imi, ma ha adighi-anuta ísì;

7Ha nwere aka-ha abua, ma ha adighi-ebitu ihe; Ha nwere ukwu-ha abua, ma ha adighi-eje ije; Ha adighi-ewere akpiri-ha me uṅara.

8Ndi nēme ha gādi ka ha: E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.

9Israel, tukwasi Jehova obi: Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.

10Ulo Eron, tukwasinu Jehova obi: Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.

11Unu ndi nātu egwu Jehova, tukwasinu Jehova obi: Iye-aka-ha na ota-ha ka Ọ bu.

12Jehova echetawo ayi: Ọ gāgọzi ayi: Ọ gāgọzi ulo Israel; Ọ gāgọzi ulo Eron.

13Ọ gāgọzi ndi nātu egwu Jehova, Ma ndi ntà ma ndi uku.

14Ka Jehova tukwasiri unu madu, Ka Ọ tukwasiri unu, tukwasi-kwa-ra umu-unu.

15Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, Onye meworo elu-igwe na uwa.

16Elu-igwe bu elu-igwe Jehova nwere; Ma uwa ka O nyeworo umu madu.

17Ndi nwuru anwu adighi-eto Ja, Ndi nile kwa ndi nārida n'ebe inọ-dū, ha adighi-eto Ya;

18Ma ayi onwe-ayi gāgọzi Ja Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Tonu Ja.

e>