1Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2Biko, ka Israel si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
3Biko, ka ulo Eron si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
4Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
5M'siri na nkpàm kpọkue Ja; Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara.
6Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem?
7Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka: Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì.
8Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi.
9Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi.
10Mba nile ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
11Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
12Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
13I nudawom enuda ka m'we da: Ma Jehova yerem aka.
14Ikem na abù ọmam ka Ja bu: Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.
15Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.
16Ebuliwo aka-nri Jehova elu: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.
17M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu, M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.
18Ja adọwom aka na nti nke-uku: Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.
19Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume: M'gābà nime ha, m'gēkele Ja.
20Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere; Ndi ezi omume gābà nime ya.
21M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom, I we ghọrọm nzọputa.
22Nkume nke ndi nēwu ulo juru Aghọwo isi nkuku ulo.
23Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere; Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi.
24Nka bu ubọchi Jehova meworo; Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.
25Biko, Jehova, zọputa, biko: Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.
26Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova: Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu.
27Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè: Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà.
28Chinekem ka I bu, m'gēkele kwa Gi: Chinekem ka I bu, m'gēbuli Gi elu.
29Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.