1Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova.
2Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu, Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya.
3E, ha emeghi ajọ omume; N'uzọ-Ya nile ka ha nēje ije.
4Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu, Ka ayi we debesie ha ike.
5Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na edoziwo uzọm nile Idebe ukpuru-Gi nile!
6Mb͕e ahu ihere agaghi-emem, Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di.
7M'gēwere obi ziri ezi kele Gi, Mb͕e m'mutara ikpé nile nke ezí omume-Gi.
8Ukpuru-Gi nile ka m'gēdebe: Arapusilam arapu.
8
9Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.
10Obim nile ka m'wereworo chọ Gi: Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.
11N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi.
12Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova: Zím ukpuru-Gi nile.
13Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọ Ikpé nile nke ọnu-Gi.
14N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ, Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile.
15N'ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'gātughari uche, M'gēlegide kwa uzọ-Gi nile anya.
16Ihe ukpuru-Gi nile gātọm utọ nke-uku: M'gaghi-echezọ okwu-Gi.
16
17Meso orù-Gi nke-ọma, ka m'we di ndu; M'gēdebe kwa okwu-Gi.
18Kpughepu anyam abua, ka m'we legide Oké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta.
19Ọbìa ka m'bu n'uwa: Ezonarilam ihe nile I nyere n'iwu.
20Nkpuru-obim etiwawo n'ihi ọchichọ O ji chọsie ikpé-Gi nile ike mb͕e nile.
21I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike, Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.
22Wepu ita-uta na nleda n'arum; N'ihi na echebewom ihe-àmà-Gi nile.
23Ọzọ, ndi-isi nọduru ala kwurita okwu imegidem: Ma orù-Gi nātughari uche n'ukpuru-Gi nile.
24Ọzọ, ihe-àmà-Gi nile bu ihe nātọm utọ nke-uku, Ha bu ndi nādum ọdu.
24
25Nkpuru-obim nārapara n'ájá: Dika okwu-Gi si di, me ka m'di ndu.
26Akọrọm akukọ uzọm nile, I we zam: Gi zím ukpuru-Gi nile.
27Me ka m'ghọta uzọ nke ihe-iriba-ama-Gi nile: M'gātughari kwa uche n'oké ọlu-Gi nile.
28Nkpuru-obim atupuwo dika miri site n'iru-újú: Dika okwu-Gi si di, me ka m'guzosie ike.
29Wezuga uzọ okwu-ugha n'ebe m'nọ: Were kwa amara nyem iwu-Gi.
30Uzọ nke ikwesi-ntukwasi-obi ka m'rọputaworo: Ikpé-Gi nile ka m'doworo n'irum.
31Araparawom n'aru ihe-àmà-Gi nile: Jehova, emela ka ihere mem.
32N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ, N'ihi na I gēme ka obim sa mbara.
32
33Jehova, zím uzọ ukpuru-Gi nile: M'gēchebe kwa ya rue mb͕e ikpe-azu.
34Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi; M'gēwere kwa obim nile debe ya.
35Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu; N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ
36Wezuga obim iche ihe-àmà-Gi nile iru, Ewezuga-kwa-la ya iche urù nēzighi ezi iru.
37Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga, Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile.
38Me ka okwu-ọnu-Gi guzosiere orù-Gi ike, Bú nke diri egwu-Gi.
39Me ka ita-utam nke m'nātu ujọ ya gabiga; N'ihi na ikpé-Gi nile di nma.
40Le, achọsiwom ihe-iriba-ama-Gi nile ike: N'ezi omume-Gi me ka m'di ndu.
40
41Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova, Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di.
42M'gāza kwa onye nātam uta okwu; N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi.
43Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum; N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo.
44M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nile Rue mb͕e nile ebighi-ebi.
45M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
46M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze, Ihere agaghi-emekwam.
47Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku, Bú nke m'huworo n'anya.
48M'gāchili-kwa-ra ihe nile I nyere n'iwu ọbu-akam, bú ihe nke m'huworo n'anya; M'gātughari kwa uche n'ukpuru-Gi nile.
48
49Cheta okwu I gwara orù-Gi, Nke I meworom ka m'chere.
50Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam: Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu.
51Ndi-nganga akwawom emò nke-uku: Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem.
52Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova, We kasie onwem obi.
53Iwe di ọku ejidewom, N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi.
54Abù ọma ka ukpuru-Gi nile buruworom N'ulo ebe m'nọ dika ọbìa.
55Echetawom aha-Gi, Jehova, n'abali, We debe iwu-Gi.
56Nka ka m'nweworo, Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile.
56
57Òkèm ka Jehova bu: Asiwom na m'gēdebe okwu-Gi nile.
58Ewerewom obim nile me ka iru-Gi dajua: Merem amara dika okwu-ọnu-Gi si di.
59Echèrem èchìchè uzọm nile, We me ka ukwum abua laghachi n'ihe-àmà-Gi nile.
60Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya, Idebe ihe nile I nyere n'iwu.
61Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu; Ma echezọghm iwu-Gi.
62N'etiti abali ka m'gēbili ikele Gi N'ihi ikpé nile nke ezi omume-gi.
63Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n'otù ka m'bu, Onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n'otù.
64Jehova, uwa juputara n'ebere-Gi: Zím ukpuru-Gi nile.
64
65I meworo orù-Gi ezi ihe, Jehova, dika okwu-Gi si di.
66Zím idi-nma nke ezi uche na ihe-ọmuma; N'ihi na ọ bu n'ihe nile I nyere n'iwu ka m'kwereworo.
67Tutu ewedam n'ala mu onwem nēme ihe ọjọ n'amaghi-ama; Ma ub͕u a okwu-ọnu-Gi ka m'debeworo.
68Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma; Zím ukpuru-Gi nile.
69Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu: Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile.
70Obi-ha bu nání abuba dika abuba; Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku.
71Ọ dim nma na ewedawom n'ala; Ka m'we muta ukpuru-Gi nile.
72Iwu ọnu-Gi dim nma Kari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu.
72
73Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike: Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu.
74Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria; N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo.
75Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume, Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala.
76Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim, Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di.
77Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu; N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku.
78Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ: Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile.
79Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem, Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile.
80Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile, Ka ihere we ghara imem.
80
81Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike: Ma okwu-Gi ka m'chereworo.
82Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike, Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi?
83N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku; Ma echezọghm ukpuru-Gi nile.
84Ùbọchi nke orù-Gi di ole? Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe?
85Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche, Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di.
86Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi: N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka.
87Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa; Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile.
88Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu, M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi.
88
89Jehova, rue mb͕e ebighi-ebi Ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe.
90Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di: I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo.
91Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta; N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi.
92Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku, Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam.
93Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile: N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu.
94Ọ bu Gi nwem, zọputam; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
95Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì; Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche.
96Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile; Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku.
96
97Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya! Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche.
98Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom; N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim.
99Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche; N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche.
100Anamaghọta ihe kari ndi-okenye, N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo.
101Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula, Ka m'we debe okwu-Gi.
102Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem; N'ihi na I zíwom ihe.
103Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ! Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu.
104M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe: N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì.
104
105Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum, Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm.
106Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike, Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi.
107Ewedawom n'ala nke-uku: Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di.
108Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova, Zíkwam ikpé-Gi nile.
109Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile; Ma echezọghm iwu-Gi.
110Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya; Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia.
111Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi; N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu.
112Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile, Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu.
112
113Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì: Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.
114Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu: Okwu-Gi ka m'chereworo.
115Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ; Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu.
116Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu; Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem.
117Kwaliem elu, ewe zọputam, M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile.
118I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya, N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu.
119I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru: N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya.
120Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi; Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.
120
121Emewom ikpe ekpere na ezi omume: Arapulam nye ndi nēmeb͕um.
122Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma: Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem.
123Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike, Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike.
124Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di, Zíkwam ukpuru-Gi nile
125Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe, Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile.
126Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu; Ha emebiwo iwu-Gi.
127N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anya Kari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha.
128N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi; Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì.
128
129Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu: N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha.
130Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.
131Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike; N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike.
132Chem iru, me-kwa-ram amara, Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya.
133Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi: Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim.
134B͕aputam na nmeb͕u nke madu: M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile.
135Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè; Zíkwam ukpuru-Gi nile.
136Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.
136
137Onye ezi omume ka I bu Jehova, Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu.
138I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omume Na ikwesi-ntukwasi-obi di uku.
139Ekworom ekpochapuwom, N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.
140Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu; Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya.
141Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya: Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile.
142Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi, Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu
143Ahuhu na nkpà achọtawom: Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku.
144Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi: Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu.
144
145Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova: Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe.
146Akpọkuwom I; zọputam, M'gēdebe kwa ihe-àmà-Gi nile.
147Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi: Okwu-Gi nile ka m'chere.
148Anyam abua buru nche-abali nile uzọ, Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi.
149Nuru olum, dika ebere-Gi si di: Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu.
150Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ; Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya.
151Gi onwe-gi nọ nso, Jehova; Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu.
152Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha.
152
153Hu nweda-n'alam, dọputam; N'ihi na echezọghm iwu-Gi.
154Kpe ọnum b͕aputakwam: Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu.
155Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ; N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile.
156Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova; Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu.
157Ha di ọtutu, bú ndi nēsob͕um na ndi nākpab͕um; Ma esighm n'ihe-àmà-Gi nile wezuga onwem.
158Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi; N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi.
159Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya: Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu.
160Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu; Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di.
160
161Ndi-isi esob͕uwom n'efu; Ma okwu-Gi nile ka obim tuworo oké egwu ha.
162Obi nātọ mu onwem utọ n'ihi okwu-ọnu-Gi, Dika onye nāhuta ọtutu ihe-nkwata.
163Okwu-ugha ka m'kpọworo asì, m'we kpọ ya ihe-árú; Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.
164Ub͕ò asa n'ubọchi ka m'toworo Gi, N'ihi ikpé nile nke ezi omume-Gi.
165Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere; Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere.
166Elewom anya nzọputa-Gi, Jehova, Ọ bu kwa ihe nile I nyere n'iwu ka m'meworo.
167Nkpuru-obim edebewo ihe-àmà-Gi nile; Anamahu kwa ha n'anya nke-uku.
168Edebewom ihe-iriba-ama-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile; N'ihi na uzọm nile di n'iru Gi.
168
169Ka iti-nkpum biarue nso n'iru Gi, Jehova: Dika okwu-Gi si di, me ka m'ghọta ihe.
170Ka aririọ-amaram bia n'iru Gi: Dika okwu-ọnu-Gi si di, naputam.
171Ka eb͕ub͕ere-ọnum kwuwa otuto; N'ihi na I nezím ukpuru-Gi nile.
172Ka irem bùa abù bayere okwu-ọnu-Gi; N'ihi na ihe nile I nyere n'iwu bu ezi omume.
173Ka aka-Gi buru ihe iyerem aka; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'rọputaworo.
174Achọsiwom nzọputa-Gi ike, Jehova; Iwu-Gi bu kwa ihe nātọm utọ nke-uku.
175Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi; Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka.
176Efughariwom dika aturu nke furu efu; chọ orù-Gi; N'ihi na echezọghm ihe nile I nyere n'iwu.