ABÙ ỌMA 120:1-7 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Nrigo. Jehova ka m'kpọkuru n'ahuhu dirim, O we zam.

2Jehova, naputa nkpuru-obim n'eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha, Na n'ire aghughọ.

3Gini ka agēnye gi, ọ̀ bu kwa gini ka agātukwasiri gi, Gi ire aghughọ?

4Àkú di nkọ nke dike, Ha na icheku-ọku nke osisi broom.

5Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek, Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida!

6Ogologo mb͕e di anya ka nkpuru-obim biriworo N'akuku onye nākpọ udo asì.

7Mu onwem bu onye-udo: Ma mb͕e m'nēkwu okwu, ndi ahu nāchọ ibu agha.

>