ABÙ ỌMA 121:1-8 IGBOB1970 - Bible AI

1Abú Nrigo. M'gēweli anyam abua le ugwu nile: Òle ebe iye-akam gēsi bia?

2Iye-akam nēsi n'aka Jehova bia, Onye meworo elu-igwe na uwa.

2

3Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya: Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura.

4Le, Ọ dighi-atu òrù-ura, Ọ dighi-araru kwa ura, Bú Onye nēdebe Israel.

5Jehova bu Onye nēdebe gi: Jehova bu ǹdò-gi n'aka-nri-gi.

6Anyanwu agaghi-etib͕u gi n'ehihie, Ọnwa agaghi-etib͕u kwa gi n'abali.

7Jehova gēdebe gi ka ihe ọjọ ọ bula ghara idakwasi gi; Ọ gēdebe nkpuru-obi-gi.

8Jehova gēdebe ọpupu-gi na nbata-gi, Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

>