ABÙ ỌMA 122:1-9 IGBOB1970 - Bible AI

1Abú Nrigo; nke Devid. Aṅuririm ọṅu mb͕e ha nāsim, Ka ayi je n'ulo Jehova.

2Ukwu-ayi eguzowo N'ọnu-uzọ-ama-gi nile, Jerusalem;

3Jerusalem, nke ewuworo Dika obodo nke ejikọtara n'otù nke-ọma:

4Ebe ebo nile rigoworo, bú ebo nile nke Ja, Iburu Israel ihe-àmà, Ikele aha Jehova.

5N'ihi na n'ebe ahu ka edoworo oche-eze nile ikpe ikpe, Bú oche-eze nile ulo Devid nwere.

6Riọnu aririọ bayere udo Jerusalem: Ndi nāhu gi n'anya gānọ n'udo.

7Ka udo di n'ékpè-gi nile, Ka inọ-n'udo di kwa n'ulo-gi nile di elu.

8N'ihi umu-nnem na ndi-eyìm, Biko, ka m'kwue okwu, si, Ka udo di nime gi.

9N'ihi ulo Jehova, bú Chineke-ayi, M'gāchọrọ gi ọdi-nma.

>