1Abù Nrigo. Gi ka m'gēweli anyam abua le, Gi Onye nānọdu ala n'elu-igwe.
2Le, dika anya ndi-orù si elekwasi aka ndi-nwe-ha, Dika anya abua nke nwayi nēje ozi si elekwasi aka nwayi nwere ike n'aru ya; Otú a ka anya-ayi nēlekwasi Jehova, bú Chineke-ayi, Rue mb͕e Ọ gēmere ayi amara.
3Mere ayi amara, Jehova, mere ayi amara: N'ihi na nleda ejuwo ayi afọ ri nne.
4Afọ ejuwo nkpuru-obi-ayi ri nne N'ichì-ọchì nke ndi nọ jū, Na nleda nke ndi-npako.