ABÙ ỌMA 124:1-8 IGBOB1970 - Bible AI

1Abú Nrigo; nke Devid. Asi na ọ bughi Jehova Nke diri ayi, Biko, ka Israel kwue otú a, si;

2Asi na ọ bughi jehova Nke diri ayi, Mb͕e madu biliri imegide ayi:

3Mb͕e ahu ha gēlowori ayi na ndu, Mb͕e iwe-ha di ọku n'aru ayi:

4Mb͕e ahu miri gēruchapuwori ayi, Miri-iyi gāgabigawori n'elu nkpuru-obi-ayi.

5Mb͕e ahu miri di nganga gāgabigawori n'elu nkpuru-obi-ayi.

6Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nēnyeghi ayi iburu ezé-ha anu-ndọb͕u.

7Nkpuru-obi-ayi ewepugawo onwe-ya dika nnunu n'ib͕udu ndi-osi-ọnyà: Ib͕udu ahu kpajiri akpaji, ayi onwe-ayi we wepuga onwe-ayi.

8Iye-aka-ayi di n'aha Jehova, Onye meworo elu-igwe na uwa.

>