ABÙ ỌMA 126:1-6 IGBOB1970 - Bible AI

1Abú Nrigo. Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ.

2Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu, Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire: Mb͕e ahu ha nāsi n'etiti mba nile, Jehova emeworo ndia ihe uku.

3Jehova emeworo ayi ihe uku; Ayi nāṅuri ọṅu.

4Jehova, me ka ndi-ayi adọtara n'agha lata, Dika miri-iyi di iche iche nime Negeb.

5Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi.

6Onye nēbu nju-aka nkpuru-ọghigha, ọ bu ezie na ọ nēje ije nākwa ákwá; Ma ọ ghaghi iwere iti-nkpu-ọṅù biaghachi, nēbu ùkwù-ọka-ya nile.

>