1Abú Nrigo. Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ọ bula nke nātu egwu Jehova bu, Nke nēje ije n'uzọ-Ya nile.
2N'ihi na ihe i chiri ọbu-aka-gi dọb͕u onwe-gi n'ọlu inwe ka i gēri: Onye ihe nāgara nke-ọma ka i bu, ọ gādi-kwa-ra gi nma.
3Nwunye-gi gādi ka osisi vine nāmi nkpuru n'ime-ime-ulo nke ulo-gi: Umu-gi gādi ka ome osisi oluve buruburu table-gi.
4Le, na otú a ka agāgọzi nwoke ahu Nke nātu egwu Jehova.
5Jehova gēsi na Zaion gọzie gi: Gi lekwasi kwa ọdi-nma Jerusalem anya ubọchi nile nke ndu-gi,
6Hu kwa umu nke umu-gi gāmu. Ka udo dikwasi Israel.