ABÙ ỌMA 13:1-6 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid. Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēchezọm ebighi-ebi? Rùe ole mb͕e ka I gēzonarim iru-Gi?

2Rùe ole mb͕e ka m'gēdo ndum-ọdu nile nime nkpuru-obim, Nēru újú n'obim n'ehihie nile? Rùe ole mb͕e ka agēbuli onye-irom elu ibu onye-isim?

3Legide anya, zam, Jehova, Chinekem: Nye anyam abua ìhè, ka m'we ghara iraru ura ọnwu;

4Ka onye-irom we ghara isi, Akariwom ya n'ike; Ka ndi-nkpab͕um we ghara iteghari egwú ọṅù mb͕e anēwezugam n'ọnọdum.

5Ma ọ bu ebere-Gi ka mu onwem tukwasiworo obi; Ka obim tegharia egwú ọṅù na nzọputa-Gi:

6Ka m'bùkue Jehova abù, N'ihi na Ọ mesowom nke-ọma.