ABÙ ỌMA 130:1-8 IGBOB1970 - Bible AI

1Abú Nrigo. N'ob͕u-miri nile ka m'siworo kpọkue Gi, Jehova.

2Onye-nwem, ge nti olum: Ka nti-Gi nāṅa kwa nti N'olu nke aririọ-amaram nile.

3Ọ buru na I riba ajọ omume nile ama, Ja, Onye-nwe-ayi, ònye gēguzo?

4Ma n'aka-Gi ka nb͕aghara di, Ka ewe tua egwu Gi.

5Elewom anya Jehova, nkpuru-obim elewo anya, Ọ bu kwa okwu-Ya ka m'chereworo.

6Nkpuru-obim nēchere Jehova, Karia ka ndi-nche si echere ututu; E, karia ka ndi-nche si echere ututu.

7Israel, chere Jehova: N'ihi na n'aka Jehova ka ebere di, Nb͕aputa riri nne di kwa n'aka-Ya.

8Ya onwe-ya gāb͕aputa kwa Israel N'ajọ omume-ya nile.

>