ABÙ ỌMA 132:1-18 IGBOB1970 - Bible AI

1Abú Nrigo. Jehova, chetara Devid Nweda-n'ala-ya nile.

2Otú ọ ṅuru Jehova iyi, Kwe Dike nke Jekob nkwa:

3N'ezie m'gaghi-abà n'ulo-ikwū nke ulom, M'gaghi-arigo n'elu ihe-ndina nke utem;

4M'gaghi-enye anyam abua ura, M'gaghi-enye mbubere-anyam irù-ura;

5Rue mb͕e m'gāchọtara Jehova ọnọdu, Chọtara Dike nke Jekob ebe-obibi.

6Le, ayi nuru okwu bayere ya n'Efrata: Ayi chọtara ya n'ọhia nke oké ọhia.

7Ka ayi ba n'ebe-obibi-Ya nile; Ka ayi kpọ isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di.

8Bilie, Jehova, ba n'ebe-izu-ike-Gi; Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi.

9Ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri ezi omume dika uwe; Ka ndi-ebere-Gi tikwa nkpu ọnu.

10N'ihi Devid, bú orù-Gi, Atugharila iru onye-Gi etere manu.

11Jehova aṅuworo Devid iyi bu ezi-okwu; Ọ gaghi-esi na ya laghachi azu: Ndi sitere na nkpuru nke afọ-gi ka M'gādọkwasi n'oche-eze i nwere.

12Ọ buru na umu-gi edebe ọb͕ub͕a-ndum Na ihe-àmàm nke M'gēzí ha, Umu-ha gānọkwasi kwa n'oche-eze i nwere rue mb͕e nile ebighi-ebi.

13N'ihi na Jehova arọputawo Zaion; Ọ chọsiwo ya ike iburu Ya ebe-obibi.

14Nka bu ebe-izu-ikem rue mb͕e nile ebighi-ebi: N'ebe a ka M'gēbi; n'ihi na achọsiwom ya ike.

15Ihe-oriri-ya ka M'gāgọzi nke-uku: Ndi-ob͕eye-ya bu ndi M'gēji nri me ka afọ ju ha.

16Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà-ya ka M'gēyikwasi nzọputa dika uwe: Ndi-ebere-ya gētisi kwa nkpu ọṅù ike.

17N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid nwere pue: Edoworom onye nkem etere manu oriọna n'usoro.

18Ndi-iro-ya ka M'gēyikwasi ihere dika uwe: Ma n'isi-ya ka okpu-eze-ya gāb͕awa okoko.

e>