ABÙ ỌMA 134:1-3 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Nrigo. Le, gọzienu Jehova, unu ndi-orù nile nke Jehova, Ndi nēguzo n'ulo Jehova n'abali nile.

2Chilienu aka-unu elu n'idi-nsọ, Gọzi kwa Jehova.

3Ka Jehova si na Zaion gọzie gi, Bú Onye keworo elu-igwe na uwa.

>