1Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2Kelenu Chineke kachasi chi nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
3Kelenu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
4Kelenu Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
5Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
6Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n'elu miri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
7Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
8Bú anyuanwu ichi n'ehihie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
9Na ọnwa na kpakpando ichi n'abali: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
10Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
11O we me ka Israel si n'etiti ha puta: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
12Site n'aka di ike na n'ogwe-aka esetiri eseti: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
13Kelenu Onye kebiworo Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
14O we me ka Israel gabiga n'etiti ya: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
15Ma O rurupuru Fero na usu-ndi-agha-ya n'Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
16Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.
17Kelenu Onye tib͕uworo ndi-eze di uku: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
18O b͕u-kwa-ra ndi-eze di ebube: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
19Bú Saihon eze ndi-Amorait: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
20Na Og eze Beshan: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
21O we nye ala-ha ibu ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
22Iburu Israel, bú orù-Ya, ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
23Onye chetara ayi n'ọnọdu-ayi di ala: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
24O we naputa ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi. N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
25Ọ nēnye anu-aru nile nri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
26Kelenu Chineke nke elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.