1Abù Ọma nke Devid. M'gēji obim nile kele Gi: N'iru chi nile ka m'agābùku Gi abù ọma.
2M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di, M'gēkele kwa aha-Gi n'ihi ebere-Gi na n'ihi ezi-okwu-Gi: N'ihi na I mewo ka okwu-ọnu-Gi di uku n'elu aha-Gi nile.
3N'ubọchi m'kpọkuru Gi ka I zaram, I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem.
4Eze nile nke uwa gēkeli Gi, Jehova, N'ihi na ha anuwo okwu nile nke ọnu-Gi.
5Ha gābù kwa abù bayere uzọ nile nke Jehova; N'ihi na ebube Jehova di uku.
6N'ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n'obi ka Ọ nāhu anya: Ma onye-npako, Ọ nēsite n'ebe di anya mara ya.
7Ọ buru na ejeghariam n'etiti ahuhu, I gēme ka m'di ndu; I gēseti aka-Gi imegide iwe ndi-irom, Aka-nri-Gi gāzọputakwam.
8Jehova gēmezurum ihe nile: Jehova, ebere-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi; Arala aka n'ọlu nile nke aka-gi abua.