1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid. Jehova, dọputam n'aka madu ọjọ; Chebem ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike di iche iche:
2Ndi chèworo ihe ọjọ di iche iche n'obi-ha; Ubọchi nile ọ bula ka ha nēzukọ ibu agha di iche iche.
3Ha amuwo ire-ha dika agwọ; Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha.
3Selah
4Debem, Jehova, ka m'ghara ida n'aka onye nēmebi iwu; Chebem, ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike: Bú ndi chèworo inuda nzọ-ukwum nile.
5Ndi-npako ezobeworom ib͕udu, na udọ̀ di iche iche; Ha ab͕asowo ub͕u n'akuku uzọ; Ọnyà di iche iche ka ha siworom.
5Selah
6Asirim Jehova, Chinekem ka I bu: Ṅa nti olu aririọ-amaram nile, Jehova.
7Jehova, Onye-nwe-ayi, ike nke nzọputam, I kpuchiwo isim n'ubọchi ihe-agha nile.
8Jehova, enyela ihe onye nēmebi iwu nāchọsi ike; Emela ka nzube ọjọ ya gara ya; ha nēbuli onwe-ha elu.
8Selah
9Ma isi ndi nọm buruburu, Ka nmeb͕u nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha kpuchie ha.
10Ka ha me ka icheku-ọku me nkpatu imegide ha: Ya me ka ha dabà n'ọku; N'ob͕u-miri, ka ha we ghara ibili ọzọ.
11Madu nke nwere ire ọjọ agaghi-eguzosi ike n'uwa: Madu nke nēme ihe-ike, ihe ọjọ ga-chunta ya inudasi ya.
12Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n'ala, Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye.
13N'ezie ndi ezi omume gēkele aha-Gi: Ndi ziri ezi gēbi n'iru Gi.