ABÙ ỌMA 143:1-12 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma Devid. Jehova, nuru ekperem; ṅa nti n'aririọ-amaram nile: N'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi zam, na n'ezi omume-Gi.

2Eji-kwa-la orù-Gi ba n'ikpé; N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n'iru Gi.

3N'ihi na onye-iro esob͕uwo nkpuru-obim; Ọ zọpiawo ndum n'ala: O mewom ka m'biri n'ebe di iche iche b͕ara ọchichri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.

4Mọm we ghara inwe ike nimem; Ibobo nānwu obim nimem.

5Echetawom ubọchi nile nke mb͕e ochie; Atughariwom uche n'omume-Gi nile: N'ọlu aka-Gi abua ka m'tughariworo obi.

6Ab͕asawom akam abua n'ebe I nọ: Nkpuru-obim di ka ala nke ida-#mbà n'ebe I nọ.

6Selah

7Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo: Ezonarilam iru-Gi; Ka m'we ghara iyi ndi nārida n'olùlù.

8Mem ka m'nuru ebere-Gi n'ututu; N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi: Mem ka m'mara uzọ nke m'gēje ije nime ya; N'ihi na Gi ka m'buliworo nkpuru-obim nye.

9Naputam n'aka ndi-irom, Jehova: N'ebe I nọ ka m'kpuchiworo onwem.

10Zím ime ihe di Gi utọ; n'ihi na Gi onwe-gi bu Chinekem: Mọ-Gi di nma; durum n'ala di lari.

11N'ihi aha-Gi, Jehova, me ka m'di ndu: N'ezi omume-Gi me ka nkpuru-obim puta n'ahuhu.

12Ọzọ, n'ebere-Gi kpochapu ndi-irom, Me kwa ka ndi nile ndi nākpab͕u nkpuru-obim la n'iyì; N'ihi na mu onwem bu orù-Gi.

e>