ABÙ ỌMA 144:1-15 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke Devid. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú oké nkumem, bu, Onye nēzí akam abua ilu ọ̀gù: Onye nēzí nkpisi-akam ibu agha:

2Eberem, na ebem ewusiri ike, Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu; Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya; Onye nāzọda ndim n'okpurum.

3Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya? Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya?

4Madu yiri otù nku-ume Ubọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.

5Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida: Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku.

6Me ka àmùmà b͕uputa, we me ka ha b͕asa; B͕apu àkú-Gi nile, we chusa ha.

7Si n'elu setipu aka-Gi; Dọputam, naputakwam n'ọtutu miri, N'aka ndi ala ọzọ;

8Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu, Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.

9Chineke, abù ọhu ka m'gābùku Gi: Une nke akwara iri ka m'gēji bùkue Gi abù ọma.

10Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa: Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n'ọnu mma-agha jọrọ njọ.

11Dọputam, nāputakwam n'aka ndi ala ọzọ, Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu, Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.

11

12Mb͕e umu-ayi ndikom di ka ihe akuru n'ala, ndi anēme ka ha bùe ibù mb͕e ha di na nwata; Umu-ayi ndinyom di ka ogidi nkuku ulo atuworo akika dika ihe-atù nke ulo uku;

13Ọba-ayi ejuwo, nēweputa ihe nile di iche iche; Igwè ewu na aturu nile ayi nāmuputa nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, orú nnù na nnù ise orú nnù na nnù ise, n'èzí nile ayi;

14Anēboju ehi nile ayi ibu nke-ọma; Ọ dighi nitpú di na mb͕idi-ayi, ọ dighi kwa ọpupu di, Ọ dighi kwa iti-nkpu di n'amá nile ayi;

15Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke di otú a: Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke Jehova bu Chineke-ha.

e>