1Abù Ọma otuto; nke Devid. M'gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze; M'gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.
2Kwa-ubọchi ka m'gāgọzi Gi; M'gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.
3Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku; Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya.
4Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ, We gosi idi-ike-Gi nile.
5N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi, Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche.
6Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa; Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m'gākọ akukọ-ya.
7Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa, Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya.
8Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu; Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ebere.
9Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di; Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile.
10Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova; Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi.
11Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa, Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya;
12Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile, Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya.
13Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile.
14Jehova nākwagide ndi nile nāda ada, O nēkuli kwa ndi nile nēruda n'ala.
15Anya ihe nile nēle anya Gi; Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.
16I nāsaghe aka-Gi, I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya.
17Onye ezi omume ka Jehova bu n'uzọ-Ya nile, Ọ di kwa ebere n'ọlu-Ya nile.
18Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya, Bú ndi nile nākpọku Ya n'ezi-okwu.
19Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme; Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha.
20Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n'anya; Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu.
21Otuto Jehova ka ọnum gēkwu; Ka anu-aru nile gọzi kwa aha nsọ Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.