ABÙ ỌMA 147:1-20 IGBOB1970 - Bible AI

1Tonu Ja; N'ihi na ọ di nma ibùku Chineke-ayi abù ọma; N'ihi na ọ di utọ, otuto mara nma.

2Jehova nēwuli Jerausalem elu; Ndi adọtara n'agha nke Israel ka Ọ nāchikọta.

3Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu, Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.

4Ọ nāguta ọnu-ogugu kpakpando; Ha nile ka Ọ nākpọ aha.

5Onye uku ka Onye-nwe-ayi bu, O nwe-kwa-ra ike riri nne; Nghọta-Ya enweghi ọnu-ọgugu.

6Jehova nēme ka ndi di ume-ala n'obi guzo ọtọ: Ọ nēme ka ndi nēmebi iwu di ala ọbuná rue ala.

7Werenu ekele za Jehova, Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma:

8Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe, Onye nēdoziri ala miri-ozuzo, Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia.

9Ọ nēnye anumanu nri-ya, Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya.

10Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ: Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ.

11Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya, Ndi nēchere ebere-Ya.

12Gi Jerusalem, nāja Jehova; To Chineke-gi, Zaion.

13N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike; Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi.

14Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo; Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.

15Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa; Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.

16Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu; Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu.

17Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha: Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya?

18Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha: Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe.

19Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya, Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile.

20O mesoghi mba ọ bula otú a: Ma ikpé-Ya nile, ha amaghi ha. Tonu Ja.

e>