1Tonu Ja. Tonu Jehova site n'elu-igwe: Tonu Ya n'ebe di elu.
2Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile: Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile.
3Tonu Ya, anyanwu na ọnwa: Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè.
4Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe, Na miri nke di n'elu elu-igwe.
5Ka ha to aha Jehova: N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha.
6O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi: Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga.
7Tonu Jehova site n'uwa, Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile:
8Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu: Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:
9Ugwu nile na ugwu ntà nile; Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile:
10Anu-ọhia na anu-ulo nile; Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù:
11Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche; Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa:
12Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ; Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri:
13Ka ha too aha Jehova; N'ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya: Ebube-Ya di n'elu uwa na elu-igwe.
14O we me ka mpi ndi-Ya nwere di elu, Iburu ndi-ebere-Ya nile otuto; Bú umu Israel, ndi di nso Ya. Tonu Ja.