ABÙ ỌMA 149:1-9 IGBOB1970 - Bible AI

1Tonu Ja. Bùkuenu Jehova abù ọhu, Bú otuto-Ya nime nkpọkọta ndi-ebere-Ya.

2Ka Israel ṅuria n'Onye meworo ya: Ka umu Zaion tegharia egwú ọṅù n'Eze-ha.

3Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú: Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma.

4N'ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ: Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n'obi nma.

5Ka ndi-ebere ṅuri ọṅu-agha nime nsọpuru: Ka ha tie nkpu ọṅò n'elu ihe-ndina-ha.

6Ka nbuli-elu Chineke di n'olu abu ha, Ka mma-agha nke iru abua di kwa n'aka-ha;

7Ibọ̀ ọ́bọ̀ n'aru mba nile, Ibara ndi nile di iche iche nba;

8Iji nkpọrọ ke ndi-eze-ha, Na iji nkpọro-ukwu ígwè ke ndi-ha anāsọpuru;

9Ime n'aru ha ikpé edere n'akwukwọ: Ihe mara nma ka ọ bu nke ndi-ebere-Ya nile nwere. Tonu Ja.

>