1Abù Ọma Devid. Jehova, ònye gānọ dika ọbìa n'ulo-ikwu-Gi? Ònye gēbi n'ugwu nsọ Gi?
2Onye nēje ije n'izu-okè, nke nālu kwa ọlu ezi omume, Nke nēkwu kwa ezi-okwu n'obi-ya.
3O jighi ire-ya kwue okwu-azu, Ọ meghi madu-ibe-ya ihe ọjọ, O bulighi kwa ita-uta megide onye-ab͕ata-obi-ya.
4Eledawo onye ajuru aju anya n'anya-ya, Ma ndi nātu egwu Jehova ka ọ nā-asọputu. Ọ ṅuwo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya, ma ọ dighi-ab͕anwe okwu-ya.
5Ọ nyeghi ego-ya inara uma, Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ. Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.