ABÙ ỌMA 2:1-12 IGBOB1970 - Bible AI

1N'ìhi gini ka mba nile meworo oké nkpọtu? N'ìhi gini ka ndi nile di n'uwa nātughari ihe-efu n'uche?

2Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha, Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù, Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,

3Ka ayi tijie ab͕u nile ha, Tufue udọ̀ nile ha n'aru ayi.

3

4Onye nānọdu n'elu-igwe nāchi ọchì: Onye-nwe-ayi nākwa ha emò.

5Mb͕e ahu Ọ gāgwa ha okwu n'iwe-Ya, Ọ bu kwa n'iwe-Ya di ọku ka Ọ gēme ka ha ma jijiji:

6Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ike N'elu Zaion, bú ugwu nsọm.

7M'gākọ akukọ bayere ukpuru: Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu; Mu onwem amuwo gi ta.

8Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi, Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi.

9I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha; Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.

9

10Ma ub͕u a, ndi-eze, nwenu uche: Ka adọ unu aka na nti, ndi-ikpe nke uwa.

11Werenu egwu fè Jehova òfùfè, Were-kwa-nu ọma-jijiji tegharia egwú ọṅù.

12Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n'iyì n'uzo, N'ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.