ABÙ ỌMA 20:1-9 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid. Jehova za gi n'ubọchi nkpà, Aha Chineke nke Jekob me ka i nọ n'elu;

2Si n'ebe nsọ Ya zìe iye-aka-gi, Si kwa na Zaion kwagide gi;

3Ya cheta onyinye-gi nile i nyeworo inata iru-ọma, Ya nara kwa àjà-nsure-ọku-gi dika abuba;

3Selah

4Ya nye gi dika obi-gi si acho, Mezu kwa ndum-ọdu-gi nile.

5Ayi gēti nkpu ọṅù na nzọputa-Gi, Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gākwuba ọkọlọtọ-ayi nelu: Jehova mezue aririọ-gi nile.

6Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu; O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-Ya Za ya site nelu-igwe-Ya di nsọ.

7Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya: Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.

8Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada: Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ.

9Jehova, zọputa eze: Ya za ayi n'ubọchi ayi kpọkuru Ya.