ABÙ ỌMA 21:1-13 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid. Jehova, n'ike-Gi ka eze nāṅuri ọṅu; Le kwa otú ọ nēteghari egwú ọṅù nke-uku na nzọputa-Gi!

2Ọ bu ihe obi-ya nāchọsi ike ka I nyeworo ya, I b͕ochighi kwa arirọ eb͕ub͕ere-ọnu-ya.

2Selah

3N'ihi na I ji ngọzi nke ọdi-nma zute ya: I nātukwasi okpu-eze nke ọla-edo anuchara anucha n'isi-ya.

4Ndu ka Ọ riọrọ n'aka-Gi, I nyewo ya ndu ahu, Bú ubọchi ndu di ogologo rue mb͕e nile ebighi-ebi.

5Nsọpuru-ya di uku na nzọputa-Gi: Ebube na ima-nma ka I nātukwasi ya.

6N'ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi: I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n'iru Gi.

7N'ihi na eze nātukwasi Jehova obi, Site kwa n'ebere nke Onye kachasi ihe nile elu agaghi-ewuzuga ya n'ọnọdu-ya.

8Aka-Gi gāchọputa ndi-iro-Gi nile: Aka-nri-Gi gāchọputa ndi nākpọ Gi asì.

9I gēme ha ka ha di ka ite-ọku uku di ọku na mb͕e I ji me ka ha hu iru-Gi: Jehova gēloda ha n'iwe-Ya, Ọku gēripia kwa ha.

10I gēme ka nkpuru-ha si n'uwa la n'iyì, Umu-ha kwa, site n'etiti umu madu.

11N'ihi na ha setipuru ihe ọjọ megide Gi: Ha chère ihe-nzube nke ha nāpughi ime.

12N'ihi na I gēme ka ha b͕akuta azu, I gēji udọ̀-uta-I dozi àkú imegide ha n'iru.

13Jehova, me Onwe-gi ka I di elu n'ike-Gi: Ayi gābù abù, bùku kwa idi-ike-Gi abù ọma.

>