ABÙ ỌMA 23:1-6 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma Devid. Jehova bu onye nāzùm dika aturu; ó dighi ihe kọrọm.

2N'ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka O nēme ka m'makpu: N'akuku miri nke izu-ike ka Ọ nedum nwayo.

3Ọ nēweghachi nkpuru-obim: Ọ nēdum n'uzọ nile nke ezi omume n'ihi aha-Ya.

4Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, M'gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n'ihi na Gi onwe-gi nọyerem: Ndele-Gi na nkpa-n'aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.

5I nēdo table n'usoro n'irum n'anya ndi nākpab͕um: I tewo isim manu; ikom bu inwebiga-ihe-ókè.

6Nání idi-nma na ebere gāb͕asom ubọchi nile nke ndum: M'gēbi kwa n'ulo Jehova rue ogologo ubọchi nile.