1Abù Ọma Devid. Jehova nwe uwa na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.
2N'ihi na Ya onwe-ya atọwo ntọ-ala-ya n'elu oké osimiri nile, Me kwa ka o guzosie ike n'elu osimiri nile.
3Ònye gārigo n'ugwu Jehova? Ònye gēguzosi kwa ike n'ebe nsọ Ya?
4Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha; Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu, Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ.
5Ọ gānata ngọzi n'aka Jehova, Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya.
6Nka bu ọb͕ọ nke ndi nācho Ya, Bú ndi nāchọsi iru-Gi ike, Chineke nke Jekob.
6Selah
7Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu; Ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi: Eze ebube gābata kwa.
8Ònye kwa bu Eze ebube a? Ọ bu Jehova, Nke bu dìnkpà na dike, Ọ bu Jehova, Nke bu dike n'agha.
9Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu; Buli-kwa-nu ha elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi: Eze ebube gābata kwa.
10Ònye ka Ọ bu, bú Eze ebube a? Ọ bu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya onwe-ya bu Eze ebube a.