ABÙ ỌMA 26:1-12 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke Devid. Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm: Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.

2Nwà m, Jehova, nwaputakwam; Nucha akurum abua na obim.

3N'ihi na ebere-Gi di n'iru anyam; Ejeghariwokwam n'ezi-okwu-Gi.

4Mu na madu efu anọkọghi; Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa.

5Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì, Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa.

6Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ; We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:

7Ime ka ege nti olu ekele, Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.

8Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya, Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.

9Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n'otù, Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n'otù:

10Ndi nzube ọjọ di n'ka-ha, Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n'iri-ngo.

11Ma mu onwem, n'izu-okèm ka m'gēje ije: B͕aputam, me-kwa-ram amara.

12Ukwum eguzowo n'ala di lari: Nime nkpọkọta madu nile ka m'gāgọzi Jehova.

>