1Abù Ọma Devid, mb͕e o siri n'iru Absalom nwa-ya b͕alaga. Jehova, le otú ndi nākpab͕um bara uba! Ọtutu madu nēbili imegidem.
2Ọtutu madu nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si, Ọ dighi nzọputa diri ya nime Chineke.
3Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum, Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu.
4Ejim olum kpọkue Jehova, O we zam site n'ugwu nsọ Ya.
5Mu onwem dinara ala, raru ura; Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem.
6M'gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta, Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu.
7Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem: N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì; I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.
8Jehova nwe nzọputa: Ka ngọzi-Gi dikwasi ndi-Gi.