1Abù Ọma; Abù nke ira Ulo ahu nye Chineke; Abù Ọma nke Devid. M'gēbuli Gi elu, Jehova; n'ihi na I dọgowom n'elu, I meghi kwa ka ndi-irom ṅuriam.
2Jehova, bú Chinekem, Etikurum, I, I we me ka m'diri ndu.
3Jehova, I mewo ka nkpuru-obim si n'ala-mọ rigoputa: I mewo ka m'si n'etiti ndi nārida n'olùlù di ndu.
4Bùkuenu Jehova abù ọma, unu ndi-ebere-Ya, Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.
5N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya; Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ: N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali, Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi.
6Ma mu onwem, asirim n'udom, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum rue mb͕e egighi-ebi.
7Jehova, I ji ka ihem si atọ Gi utọ me ka ike guzoro ukwu m: I zobere iru-Gi; aghọrọm onye nāma jijiji.
8Gi, Jehova, ka m'nākpọku; Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi ka m'nāriọ aririọ-amara:
9Ùrù gini di n'ọbaram, mb͕e m'na-arida n'olùlù? Ájá, ọ̀ gēkele Gi? ò gēgosi ezi-okwu-Gi?
10Nuru, Jehova, me-kwa-ram amara: Jehova, buru onye nēyerem aka.
11I b͕anweworom iti-aka-n'obim ka ọ ghọ ite-egwú; I tọpuwo ákwà-nkpem, were ọṅù kem dika ihe-ọkiké:
12Ka nsọpurum we bùkue Gi abù ọma, ghara idere du. Jehova, bú Chinekem rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gēkele Gi.