1Abù Ọma nke Devid. Maschil.Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye ebupuworo njehie-ya, onye ekpuchiworo nmehie-ya.
2Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú madu nke Jehova nādighi-aguru ya ajọ omume,Bú onye ọ dighi aghughọ ọ bula di na mọ-ya.
3Mb͕e m'b͕ara nkiti, ọkpukpum nile kara nkáSite n'ọb͕ub͕ọ-ujam ogologo ubọchi nile.
4N'ihi na ehihie na abali aka-Gi di arọ̀ n'arum:Umem b͕anwere n'ihe-ikpọ-nku nke uguru.
4Selah
5Anamemeri ka I mara nmehiem, ekpuchighkwam ajọ omumem:M'siri, M'gēkwuputara Jehova njehiem nile;Gi onwe-Gi bupu-kwa-ra ajọ omume nke nmehiem.
5Selah
6N'ihi nka ka onye-ebere ọ bula kpere Gi na mb͕e agēji chọta Gi:N'ezie n'iju-miri nke ọtutu miri ha agaghi-eru ya aru.
7Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m'pua n'ahuhu;Iti-nkpu nke mb͕e anēme ka ab͕apu, ndia ka I gēme ka ha dim buruburu.
7Selah
8M'gēme ka i nwe uche, M'gēzi kwa gi ihe n'uzọ nke i gēje ije nime ya:M'gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n'aru.
9Unu adila ka inyinya, ma-ọbu dika inyinya mule, nke ọ dighi nghọta ha nwere:Agēji kwa bit na bridle, dika ihe-ekike, ijide ha,Ma emeghi otú a ha agaghi-abiaru nso gi.
10Ọtutu ihe-nb͕u gādiri onye nēmebi iwu:Ma onye nātukwasi obi na Jehova, ebere gādi ya buruburu.
11Ṅurianu ọṅu na Jehova, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, unu ndi ezi omume:Ti-kwa-nu nkpu ọṅù, unu nile ndi ziri ezi n'obi.