1Abù Ọma nke diri Onye-sisi Abù. Abù Ọma Devid. Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n'imeso onye nēnweghi ike: N'ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya.
2Jehova gēdebe ya, me ka ọ di ndu, agēme ka ihe gara ya nke-ọma n'uwa; Enye-kwa-la ya n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi-iro-ya.
3Jehova gākwagide ya n'elu ihe o ji edina mb͕e aru nādighi ya ike: Ihe-ndina-ya nile ka I b͕anweworo n'ọria ya.
4Mu onwem siri, Jehova, merem amara: Me ka nkpuru-obim diri ndu; n'ihi na emehiewom megide Gi.
5Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si. Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n'iyì?
6Ọ buru kwa na ọ bia ihum, ihe-efu ka ọ nēkwu; Obi-ya nāchikọtara onwe-ya ajọ ihe: Ọ nāpu n'èzí nēkwu ya.
7Ndi nile nke nākpọm asì nātakwurita ntakwu imegidem: N'imegidem ka ha nēchèrem ihe ọjọ.
8Anāwukwasi ya ihe jọb͕uru onwe-ya, ka ha kwuru: E, nke o dinaworo ub͕u a ọ gaghi-ebili ọzọ.
9Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim, Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem.
10Ma Gi onwe-gi, Jehova, merem amara, me ka m'bilie, Ka m'we kwughachi ha ugwọ.
11Nka ka m'ji mara na ihem nātọ Gi utọ, N'ihi na onye-irom adighi-eti nkpu nmeri n'arum.
12Ma mu onwem, n'izu-okèm ka I jideworom, We me ka m'guzosie ike n'iru Gi rue mb͕e ebighi-ebi.