ABÙ ỌMA 45:1-17 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shoshannim; Abù Ọma nke Umu Kora. Maschil. Abù ihe-utọ. Obim ab͕ọputawo okwu di nma: Mu onwem nēkwu okwu; olum diri eze: Irem bu pen nke onye nēde akwukwọ ngwa ngwa.

2Emewo gi ka i ma nma kari umu madu; Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua: N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi.

3Ke mma-agha-gi n'úkwù-gi, gi dike, Ebube-gi na ima-nma-gi.

4N'ima-nma-gi nọkwasi n'elu inyinya ga nke-ọma, N'ihi ezi-okwu na ume-ala-n'obi na ezi omume: Aka-nri-gi gēzí kwa gi ihe di iche iche di egwu.

5Àkú-gi nile bu ihe di nkọ; Ndi nile di iche iche nāda n'okpuru gi; Àkú-gi di n'obi ndi-iro eze.

6Oche-eze-Gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi: Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka-eze nke ala-eze-Gi bu.

7I huwo ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì: N'ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere gi Manu obi-utọ n'isi kari ndi-ibe-gi.

8Myrrh na aloes na cassia juputara uwe-gi nile; Site n'ulo uku nile nke ọdu ubọ-akwara emewo ka i ṅuria ọṅu.

9Umu-ndinyom ndi-eze muru nọ n'etiti ndinyom-i di oké ọnu-ahia: Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n'aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia.

10Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n'ala; Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi;

11Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike: N'ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya.

12Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia; Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua.

13Ada eze nke nọ nime ulo dichasi nsọpuru: Ihe akpagwara ọla-edo ka uwe-ya bu.

14N'uwe akpara nke-ọma ka agēduru ya jekuru eze: Umu-ab͕ọghọ, nāmaghi nwoke ndi nēso ya n'azu, bú ndi-ibe-ya, Anēme ha ka ha biakute gi.

15Eji ọṅù na otite-egwú-ọǹù duru ha: Ha gābà n'ulo uku eze.

16Umu-gi gānọchi anya nna-gi-hà, I gēdo ha ndi-isi n'uwa nile.

17M'gēme ka echeta aha-gi n'ọb͕ọ nile: N'ihi nka ndi nile di iche iche gēkele gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

>