ABÙ ỌMA 46:1-11 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma nke umu Kora; n'elu Alamoth. Abù. Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile.

2N'ihi nka ayi agaghi-atu egwu mb͕e uwa nāb͕anwe, Ma-ọbu mb͕e anēwezuga ugwu nile n'ọnọdu-ha ga n'etiti oké osimiri;

3Mb͕e miri-ya nāb͕a aghara nāsu kwa ufufu, Mb͕e ugwu nile nēme nkpatu site na nbili-elu ya.

3Selah

4Otù osimiri di, miri-iyi-ya nile nēme ka obodo Chineke ṅuria ọṅu, Bú ebe nsọ nke ebe-obibi nile nke Onye kachasi ihe nile elu.

5Chineke nọ n'etiti ya; agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Chineke gēyere ya aka mb͕e chi bọrọ.

6Mba nile ozo b͕ara aghara, ewezugara ala-eze nọnọdu-ha: O mere ka olu-Ya da, uwa nabaze.

7Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu.

7Selah

8Jenu, hu ọlu nile nke Jehova, Onye doworo ihe-iju-anya di iche iche n'uwa,

9Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa; Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube; Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n'oku.

10Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke: Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa.

11Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu.

11Selah

>