ABÙ ỌMA 47:1-9 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma umu Kora. Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka; Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke.

2N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu; Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile.

3Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n'okpuru ayi, Ọ nēdu kwa mba nile bia n'okpuru ukwu-ayi.

4Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi, Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n'anya.

4Selah

5Chineke ewerewo iti-nkpu rigo, Jehova ewerewo olu opì-ike rigo.

6Bùkuenu Chineke abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma: Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma.

7N'ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu: Bùkuenu Ya abù ọma, maschil.

8Chineke aghọwo eze mba nile: Chineke anọkwasiwo n'oche-eze nsọ Ya.

9Ndi amara aha-ha nke ndi nile di iche iche achikọtawo onwe-ha Ibu ndi Chineke nke Abraham: N'ihi na Chineke nwe ọta nile nke uwa; Emewo ka Ọ di elu nke-uku.