1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma Umu Kora. Nurunu nka, ndi nile di iche iche; Ṅanu nti, ndi nile bi n'uwa nka:
2Ma ndi di ala ma ndi di elu, Ọgaranya na ob͕eye n'otù.
3Ọnum gēkwu okwu amam-ihe nile; Ntughari-uche nke obim gābu kwa nghọta nile.
4M'gātọ ntim n'ala n'ilu: M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara.
5N'ìhi gini ka m'gātu egwu n'ubọchi ihe ọjọ, Mb͕e ajọ omume nke ndi nējidem n'ikiri-ukwu dim buruburu,
6Bú ndi nātukwasi obi n'àkù-ha, Nānya kwa isi n'iba-uba nke ọgaranya ha bu?
7Ọ dighi onye ọ bula gāb͕aputa nwa-nne-ya ma-ọli, Ọ gaghi-enye Chineke ihe-nb͕aputa-ya:
8(N'ihi na nb͕aputa nkpuru-obi-ha di oké ọnu-ahia, Ọ gāra kwa ya aka rue mb͕e ebighi-ebi:)
9Ka o we digide ndu rue mb͕e ebighi-ebi, Ghara ihu nbibi anya.
10N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu, N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì, We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.
11Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi, Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile; Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha.
12Ma madu adighi-anọgide na nsọpuru: O yiri anu nke emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.
15Selah
16Atula egwu mb͕e madu nēme ọgaranya, Mb͕e nsọpuru nke ulo-ya nāba uba:
17N'ihi na mb͕e ọ nwuru ọ gaghi-ewere ihe ahu nile la; Nsọpuru-ya agaghi-arida so ya.
18N'ihi na mb͕e ọ di ndu ọ nāgọzi nkpuru-obi-ya, Madu nēkele kwa gi mb͕e i nēmere onwe-gi ezi ihe.
19Ọ gābakuru ọb͕ọ nna-ya-hà; Rue mb͕e ebighi-ebi ha agaghi-ahu ìhè.
20Madu nke nọ na nsọpuru, ma ọ dighi-aghọta ihe, Yiri anu emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.