ABÙ ỌMA 49:1-20 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma Umu Kora. Nurunu nka, ndi nile di iche iche; Ṅanu nti, ndi nile bi n'uwa nka:

2Ma ndi di ala ma ndi di elu, Ọgaranya na ob͕eye n'otù.

3Ọnum gēkwu okwu amam-ihe nile; Ntughari-uche nke obim gābu kwa nghọta nile.

4M'gātọ ntim n'ala n'ilu: M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara.

5N'ìhi gini ka m'gātu egwu n'ubọchi ihe ọjọ, Mb͕e ajọ omume nke ndi nējidem n'ikiri-ukwu dim buruburu,

6Bú ndi nātukwasi obi n'àkù-ha, Nānya kwa isi n'iba-uba nke ọgaranya ha bu?

7Ọ dighi onye ọ bula gāb͕aputa nwa-nne-ya ma-ọli, Ọ gaghi-enye Chineke ihe-nb͕aputa-ya:

8(N'ihi na nb͕aputa nkpuru-obi-ha di oké ọnu-ahia, Ọ gāra kwa ya aka rue mb͕e ebighi-ebi:)

9Ka o we digide ndu rue mb͕e ebighi-ebi, Ghara ihu nbibi anya.

10N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu, N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì, We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.

11Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi, Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile; Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha.

12Ma madu adighi-anọgide na nsọpuru: O yiri anu nke emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.

12

13Uzọ-ha nka buru ha nzuzu: Ma mb͕e ha gasiri okwu-ọnu-ha nātọ madu utọ.

13Selah

14Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye; Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu: Ndi ziri ezi gēnwe ike n'aru ha n'ututu; Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya.

15Otú ọ di, Chineke gāb͕aputa nkpuru-obim n'aka ala-mọ: N'ihi na Ọ gēkurum la.

15Selah

16Atula egwu mb͕e madu nēme ọgaranya, Mb͕e nsọpuru nke ulo-ya nāba uba:

17N'ihi na mb͕e ọ nwuru ọ gaghi-ewere ihe ahu nile la; Nsọpuru-ya agaghi-arida so ya.

18N'ihi na mb͕e ọ di ndu ọ nāgọzi nkpuru-obi-ya, Madu nēkele kwa gi mb͕e i nēmere onwe-gi ezi ihe.

19Ọ gābakuru ọb͕ọ nna-ya-hà; Rue mb͕e ebighi-ebi ha agaghi-ahu ìhè.

20Madu nke nọ na nsọpuru, ma ọ dighi-aghọta ihe, Yiri anu emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.

>