1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; nke agābù n'ib͕u Ọjà. Abù Ọma Devid. Ge nti n'okwu-ọnum, Jehova, Ghọta ntughari-uchem.
2Ṅa nti n'olu ntiku m'nētiku Gi, Ezem, na Chinekem: N'ihi na ọ bu Gi ka m'nēkpere.
3Jehova, n'ututu ka I gānu olum; N'ututu ka m'gēdoro Gi ekperem n'usoro, che kwa nche.
4N'ihi na ọ bughi Chineke nke nmebi-iwu nātọ utọ ka I bu: Ihe ọjọ agaghi-anọ dika ọbia n'ebe I nọ.
5Ndi nānya isi agaghi-eguzo onwe-ha n'anya-Gi: I kpọrọ ndi nile nālu ajọ ihe asì.
6I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n'iyì: Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú.
7Ma mu onwem, n'uba nke ebere-Gi ka m'gābà n'ulo-Gi: M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di n'egwu-Gi.
8Jehova, dubem n'ezi omume-Gi n'ihi ndi nēchem anwu; Me ka uzọ-Gi zie ezi n'irum.
9N'ihi na ọ dighi ihe nke nēguzosi ike di n'ọnu-ya; Ime-ha bu ila-n'iyì nile: Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha nēkwu okwu ire-utọ.
10Ma ha ikpe, Chineke; Ka ha da ada site na ndum-ọdu nile ha: N'uba nke njehie nile ha nupu ha; N'ihi na ha anupuwo isi imegide Gi.
11Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria, Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I nēkpuchi ha ǹdò: Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n'anya tọ ha utọ nime Gi.
12N'ihi na Gi onwe-gi nāgọzi onye ezi omume; Jehova, I ji otú ihe-ya si atọ Gi utọ b͕a ya buruburu dika ọta uku.