1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Maschil Devid: mb͕e Doeg, bú onye Edom, biara gosi Sọl, si ya, Devid bara n'ulo Ahimelek.Gini mere i nēto onwe-gi n'ihe ọjọ, gi dike?Ebere Chineke nādigide ogologo ubọchi nile.
2Ihe-ila-n'iyì di iche iche ka ire-gi nēchè;Dika aguba di nkọ, nālu ọlu aghughọ.
3I huwo ihe ọjọ n'anya kari ezi ihe;Na okwu-ugha kari ikwu okwu ezi omume.
3Selah
4I huwo okwu nile nēloda eloda n'anya,Gi ire aghughọ.
5Chineke gākwatu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi,Ọ gējide gi, dọkpupu gi n'ulu-ikwū-gi,Ropu kwa gi n'ala ndi di ndu.
5Selah
6Ndi ezi omume gāhu kwa ya we tua egwu,Chì kwa ya ọchi, si,
7Le, nwoke nke nādighi-eme Chineke ebe-ya siri ike;Kama ọ tukwasiri obi n'uba nke àkù-ya,Ọ di ike n'ọchichọ ọjọ ya.
8Ma mu onwem, adim ka osisi olive nwere akwukwọ ndu n'ulo Chineke:Atukwasiwom obi n'ebere Chineke rue mb͕e nile ebighi-ebi.
9M'gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I meworo ya:M'gēle kwa anya aha-Gi, n'ihi na ọ di nma, niru ndi-ebere-Gi.